A LIST OF IGBO CHRISTMAS SONGS/HYMNS

A keyboard with Christmas decoration and an Igbo Hymn book resting on it.

Share This Post

Most of us are so focused on learning and singing hymns, songs, and carols in English that we forget that there are also amazing Igbo Christmas songs. The Christmas season is such a colorful, joyful season, and what makes it so interesting is the numerous hymns, carols, and songs that allow you to sing your heart out. It is more colorful when you can also sing them as English Christmas Songs, Yoruba Christmas Songs, and in numerous other languages.

Below is a list of Igbo Christmas Songs/Hymns and their lyrics in the Igbo Language.

A choir holding a hymnal and singing igbo christmas songs/hymns
A choir holding a hymnal and singing Igbo Christmas hymns

1. Unu ndi-m’ozi nke igwé (Angels from the realms of glory).

Verse 1

Unu ndi-m’ozi nke igwé,

Fesanu n’uwa nile;

Ndi kor’akuko okike,

Kwusanu omumu Kraist:

Bianu, kele1.

Eze amuru ohu.

Verse 2

Ndi-nche-aturu no n’ohia,

Nech’aturu n’abali;

Chineke nonyere madu,

Ihe Nwa ohu nenwu:

Bianu, kele

Eze amuru ohu.

Verse 3

Ndi-amam-ihe bilienu,

Ihe nenwu n’ir’unu;

Chonu Onye mba-dum-nachọ,

Lenu kpakpando ahu:

Bianu, kele

Eze amuru ohu.

Verse 4

Ndi nsọ neche n’iru Chuku

N’olile-anya n’egwu;

Na mberede Jisus abia,

Agahu Ya n’ulo-Ya;

Bianu, kele

Eze amuru ohu. amen.

2. Otu mgbe n’obodo Devid (Once in royal David’s city).

Verse 1

Otu mgbe n’obodo Devid

Otu ulo anu di,

Eb’otu Nwanyi nyibere

Nwa-ya o muru ohu;

Meri bu nne om’ahu,

Jisus Kraist bu Nwa nke-ya.

Verse 2

Ọ si n’igwé rida n’uwa,

Onye bu Chineke-ayi;

Ulo anu zere Ya ndu,

Ọ dina n’ebe ahu;

Nd’ogbenye ndi di ala

Ka Jisus-ayi binyere.

Verse 3

Mgbe nile Ọ dina nwata

Ọ ji nsọpuru nanu

Okwu nwanyi nke muru Ya,

Nke kuru Ya n’aka-ya;

Umu-nta Jisus geme

Ez’omume dika Ya.

Verse 4

Ya bu Onye ayi genomi,

Ọ toto dik’ayi si eto,

Ọ dichasi otu ayi di,

Ọ mara akwa n’ochi;

Nwuta-ayi newuta Ya,

Ọṅu-ayi bu kwa  nke-Ya.

Verse 5

M’emesia any’ayi gahu Ya,

Site n’ihu-n’anya-Ya;

N’ihi na Nwata ọma nka

Bu Eze-ayi n’el’igwé;

Ọ nedu umu nke-Ya

We rue n’eb’ahu Ọ no. Amen.

3. Mgbe ndi naz’aturu neche (While shepherds watch)

Verse 1

Mgbe ndi naz’aturu neche

Aturu n’abali,

M’ozi we bia guzọ ha nsọ,

Ok’ebube nwuba.

Verse 2

“Atula egwu,” o siri,

Ka egwu natu ha,

“Ozi ọma nk’oke onu

Ka m’nezi unu dum.”.

Verse 3

“Ta, nim’obodo nke Devid,

K’amuru nye unu

Onye-nzọputa nke bu Kraist,

Nka gabu ih’ama: –

Verse 4

Unu gahu Nwa ekere

Nim’akwa-okike,

Dina n’ihe anetiye

Nri nke anu-ulo.”.

Verse 5

Otu a k’o kwuru; le, ha hu

Usu ndi mo-ozi,

Ndi nenye Chinek’otuto;

Ha nabu abu, si: –

Verse 6

“Otutọ diri Chineke

N’ebe kasi elu,

Udo n’uwa nime madu

Rue mgbe ebigh-ebi.”     Amen.

4. Ge nti! Ndi-m’ozi nabu (Hark! the hearld angels sing)

Verse 1

Ge nti! Ndi-m’ozi nabu

Neto Ez’amur’ohu;

Udo di n’elu uwa,

Chuku na ndi-njọ edo!

Nuria onu mba nile,

Soro n’onu nke igwé;

igwé na ala nasi,

Ta k’amuru Jisus Kraist.

Verse 2

Kraist, Onye nd’igwé naja;

Kraist, Eze ebigh-ebi;

Na mgbe nke-Ya k’Ọ biara,

Nwa nke Agbogho di nsọ.

Le, Chuku yiri aru;

To Onye ghoro madu;

Ọ toro Y’igho madu;

Jisus Kraist, Immanuel.

Verse 3

Kelenu Eze udo,

Kel’Onye-ez’omume;

Ihe na Ndu k’Ọ ji bia,

Nagwo oria madu dum.

Ọ rapur’ebube-Ya,

Bia ka madu ghar’inwu,

Ka madu nile bilie,

Ka amukwa ha ohu.

Verse 4

Bia, Onye mba dum nachọ,

Biri nime ayi nile;

Bilie, Nkpuru nke nwayi,

Chifia isi nke Agwo.

Hichap’onyinyo Adam,

Tiyechie onyinyo-Gi;

Nye madu dum Onwe-Gi,

Kpua Onwe-Gi n’obi-ayi.   Amen.

Children singing Igbo Christmas Songs
Children singing Christmas Igbo songs

5. Bianu, nd’okwukwe (o come all ye faithful).

Verse 1

Bianu, nd’okwukwe,

N’onu nke di Ukwu,

Bianu, bianu, k’ayi je rue Betlehem;

L’Eze ndi-m’ozi,

Nke amuru n’uwa;

Bianu, k’ayi sopuru Ya,

Bianu, k’ayi sopuru Ya,

Bianu, k’ayi sopuru Ya, nu Eze Kraist.

Verse 2

Chuku, Nwa Chuku,

Ihe ebigh-ebi,

Le, Ọ leligh afo nke Nw’agboho;

Ezi Chineke,

Nke anekegh eke;

Bianu, k’ayi sopuru Ya,

Bianu, k’ayi sopuru Ya,

Bianu, k’ayi sopuru Ya, nu Eze Kraist.

Verse 3

Nd’abu ndi-m’ozi,

Buanu n’oke onu,

Buanu, unu ndi nile bi n’igwé;

Otutọ diri

Chineke n’el’igwé;

Bianu, k’ayi sopuru Ya,

Bianu, k’ayi sopuru Ya,

Bianu, k’ayi sopuru Ya, nu Eze Kraist.

Verse 4

Ayi ekele Gi,

Onye amuru ta;

Jisus, Otutọ nile diri Gi;

Okwu Chineke,

Onye ghoro madu;

Bianu, k’ayi sopuru Ya,

Bianu, k’ayi sopuru Ya,

Bianu, k’ayi sopuru Ya, nu Eze Kraist. Amen.

6. Nu uda onu! Ọ nabia (Hark the glad sound! the Saviour comes)

Verse 1

Nu uda onu! Ọ nabia,

Bu Onye-nzọputa;

K’obi-ayi bur’och’eze-Ya,

K’olu-ayi bua abu.

Verse 2

Ọ nabia izọputa ndi

Ekwensu ker’agbu;

N’iru Ya uzọ emeghe,

Agbu dum atopu.

Verse 3

Ọ nabia ikpocha obi

N’ochichiri nmehie:

K’Ọ tinye ihe el’igwé

N’anya onye-isi.

Verse 4

Ọ nabia ikasai obi,

Igwo ndi dara mba;

Iwer’aku-Ya m’ogbenye

K’Ọ gho ogaranya.

Verse 5

Eze udo, Hosanna-ayi

K’ayi geji kele Gi;

Uda-aha-I, di ayi utọ,

Gada n’igwé nile. Amen.

7. Ndi Kraist, teta, kel’utut’ona nka (Christians, awake!)

Verse 1

Ndi Kraist, teta, kel’utut’ona nka,

Mgbe amur’Onye-nzọputa nk’uwa;

Bilie, to ihu-n’anya Chineke,

Nke ndi-m’ozi si n’el’igwé neto;

Ha bu uzọ zi ozi om’ahu

Na Nwa Chineke ghoro Nwa madu.

Verse 2

Mgbe ahu ndi neche aturu-ha

Nur’olu otu m’ozi si ha: “Le,

Ewetaram unu ozi ọma

Na amur’unu Onye-nzọputa:

Chineke emezuwo nkwa-Ya ta,

Ta k’amuru Onye-nzọputa, Kraist,”

Verse 3

Ọ kwusia; ma, le, ndi-abu nk’igwé

Ji onu b’abu akanugh na mbu,

Neto ihu-n’anya nke Chineke,

Haleluya-ha juputa igwé;

Otutọ Chineke bu abu-ha,

Udo di n’uwa n’etiti madu.

Verse 4

Ndi-nch’aturu jeer na Betlehem

Ihu ih’ebube Chuku mere;

Ha hu Josef, na Meri di ngọzi,

Na Nwa o muru, bu Onye-nwe-ayi;

Ha we ko akuko ebube nka,

Buru nd’ozi mbu nke Nw’ohu ahu.

Verse 5

Ọ kwesir’ayi, dika ndi-nch’aturu,

Ij’ekele zisa oz’ọma nka;

Soro Jisus, b’Onye-ngbaputa-ayi,

Site n’omumu-Ya rue n’onwu-Ya;

Neso nzo-ukwu-Ya n’ike nke-Ya,

Rue mgbe ayi genwe onodu n’igwé.

Verse 6

Mgb’ahu n’etiti ndi bi n’el’igwé,

Ayi gabu abu onu ngbaputa;

Onye amuru ta geme k’ayi hu

Ebube-Ya gburugburu ayi dum;

Ayi gabu abu mgbe ebigh-ebi,

Neto Eze ndi-m’ozi na madu. Amen.

8. Abali nsọ, nke di kwa ju (Still the night, holy the night)

Verse 1

Abali nsọ, nke di kwa ju!

Mgbe uwa no n’ura,

Meri na Josef no n’ulo anu

Neche Nwa olu nk’ahuru n’anya,

No n’ura udo igwé,

No n’ura udo igwé.

Verse 2

Abali nsọ, nke di kwa ju!

Ndi nazu aturu-ha

Huru ihe-ọma n’igwé,

Nu Ka ndi-m’ozi nabu, si:-

“Onye-ngbaputa biara!

Onye ngbaputa biara!”

Verse 3

Abali nsọ, nke di kwa ju!

Nwa Chineke ọma,

Iru-Gi negos’ihu-n’anya!

Nye ayi amara n’oge d’ugbu a,

Gi Onye-nzọputa,

Gi Onye-nzọputa. Amen.

Going traditional is always adventurous, especially with Christmas songs that we all are so used to singing in just English. We hope that with these Igbo Christmas Songs lyrics that we have provided, you can have some nice twists to your Christmas carols, plus we greatly hope that it turns out much better than you had imagined. Keep in mind also to wish your loved ones a merry Christmas with different lovely Christmas greetings to warm up their hearts, showing them how much they mean to you.

Enjoy! 🎄🤗

2 thoughts on “A LIST OF IGBO CHRISTMAS SONGS/HYMNS”

  1. Pingback: A LIST OF CHRISTMAS HYMNS IN YORUBA - Learners Dorm

  2. Pingback: 100 Best Christmas Greetings for Cards and Messages 2022/2023

Leave a Comment

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Be Updated!

I'd rather be first in line to get learning opportunity updates, would you?

More To Explore